Proverbs 17

1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya,
karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.

2Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere
ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.

3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma Onyenwe anyị na-anwale obi.

4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,
onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.

5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya.
Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.

6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.

7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu,
otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.

8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ,
ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.

9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie,
ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.

10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru
karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.

11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi
Ya bụ, omume megidere iwu ya
megide Chineke.
Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ
Ya bụ, onyeozi na-adịghị eme obi ebere.
ka a ga-eziga imegide ya.

12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya
karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.

13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,
ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.

14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,
nʼihi ya ekwela ka ọ malite.

15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,
Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.

16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;
ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.

17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.
Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.

18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,
si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.

19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.
Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.

20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.
Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.

21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ
dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.

22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,
ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.

23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị c na nzuzo
ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.

24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,
ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.

25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,
bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.

26Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma,
nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.

27Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe,
onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.

28A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị,
gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
Copyright information for IboBIU